ÓCHÚCHÚ MALLAM GANIYU (The Sack of Mallam Ganiyu)

image

Mallam Ganiyu bú ónyé nche Ezínúlò ndi be Odozie, kemgbe di ókpala ha bu Izunna bú nwatakiri. Anà àkwú ya ezigbo ego, obúrú ya na émépe ónú úzò ama fa, nya na emechi ya, nya na àkpú ókookò ósisi nííle akó na yard fa, ma na eje ózi.

Lolo Odozie bú ezigbo nwanyi, óna enye Mallam Ganiyu nni niile òna esi, ónaaghi eme ka úfòdú ndi mmadu na énye ónye nche fa nni érifórò érifó.

Mgbe Chief Odozie nwuru, Ganiyu chęfúrú na óbù okenye, óna ebe akwa ka nwatakiri. Ónwuru iyi na óga èso Chief banye n’íme àlá. Maka na Chief bu ónye úkwù na obodo ya àná àkpó Arochukwu, àgba èzigbo ófala mgbe akwa ózu ya.

Ezinulo ndi bé Odozie túkwasiri òbi fa ófuma na Mallam Ganiyu, fa nwere ike į rapu so nya n’úlò wéé ga njém. N’ihi ya, ahapuru ya n’ulo wee nà obodo maka àkwámá ózu Chief, mgbe fa bata, Úlò gosiri na onwe ezigbo mmadu na éche yà

***

“Adaeze àmúgò nwà! ”

Izunna wélitère ísí ya na àkwùkwó àkúkò ó na àgú, aha ya bú ThisDay Style. Ónwere éziģbo àkwà ó fúrú na ahú ónyé ègwú àná àkpó D’banj, akwa àhú mere ka D’banj chapuru a chapu na nme nme ó gara. Izunna na akwado isé ya foto, ka ó ziri onyé na àkwará ya àkwa túpú Nne ya é tie mpu ánwùri.

Lolo Odozie chiri ékwé nti yà n’aka nà agba ègwú.

“Ízu-mama! Bia lee ihe oma Chineke nna mere mu o…”

Adaora bú ódúdù nwa ya biri na obodo America. Izunna hapú ífe ó na émé jekwúrú Nne ya, bie ya óma, kene ya ékéne nwa ófú.

Ónye óbúla mara na Lolo ga àkwádo iga Omugwo. Óru omugwo ya étego kwa àká, óburó tààtá. Nke à ga eme ya isi na úmú úmú mu Lolo Odozie nwéré. Ó gàlá omugwo di iché iché n’obodo di iché iché. Adaeze na Adaugo bu úmú ya mugoro úmú, nwuye Izunna bú Onaedo di kwú ìmè.

Visa búrú nsogbu ikpéazú lolo nwere,  ya méré na ogbúrodù oge, ó jiri úbochí àtó banye niime àhiá na egó só àzú, okporoko na ihe ndí ózó nne nwayi ji àgà omugwo. Ķa ómesià, o puo njem Omugwo na Obodo America.

Óge ahú ka nsogbú bidóró.

N’ihí na Úló nna ya lúru búrú ezigbo ibu, ónye óbula kwére na óbaró úru ya i hapu ébe àhú, je biri na akwú úgwó n’úló mmadu.

Nwunye Izunna bu Onaedo, óbúrókwa na óbú nwanyi ójóó, mana ória na éme úfodú úmù nwanyi mgbe hà di ime na émè ya. Ahú na àgbàkasi ya ógé óbula.

“Ganiyu!”

Ótú à ka óga na étimkpú ogé óbúla.

“Yes Madam”

Ganiyu fúrú yà na n’ànyá ótù ósi wee fúkwa ndi Ezinúló Odozie niile nà ànyá. Óge àlútara yà, óbi anwùri júri ya.

“Jee gótére m Akamu”

“Ganiyu! Jee gótére m ólòma”

“Ganiyu, jee gótére m bread”

“Ganiyu, bia fichara m úgbó-ala mú”

Ganiyu na éficha kwa úgbó-ala niile diri nà bé fa útútù óbúla, mana Onaedo ga ézi ózi yà fichakwa ya ózò. Onaedo ékwèrozi ka Ganiyu nwúó mmiri tógbò ikò.

Órúo otú mbosi, Onaedo tétere na Úla ébé ifé dika élékérè iri na ótú nké àbáli.

“Ganiyu!”

Óbi mapúrù Izunna

“Onaedo nwúnye’m, ó gini ka iji abali àkpó Ganiyu biko?”

 Onaedo ma ósú

“Ónye nche ka óbú, agam àkpó ya óge óbula ó sóró mu”

Túpú Izunna màrá ifé na émè, Onaedo àgbadá gó ala, nyèré Ganiyu égó si ya jé gótere ya Ókpa di ókù.

“Madam, Ókpa?”

Òzi óbú gba Ganiyu yari. Óbu éziókwú na kemgbe Onaedo túrú imé, ónà ézi ózi nzúzú dí íché íché.

Ónwéré mgbé ó zírí yà į góté Akara dí óku n’ímé ímé ànyasí. Ganiyu jee énu, jee ànà túpú ófúrú nwanyí si óbodó yà ó kówarà, nwanyi àhu wee jirí maka ya biníe i heré yà akara óbú.

Màna nke Òkpa? Madam echefúlà nà ó ĺagos kà fa bi, ísi ódikwa ya bú Ónaedo Odozie mma? Óchere na ónó Upper íweka?

Izunna ayógó ya na mbú ka ó na édí ifé nwúnye yà nà émé, màka na óbu afó ime na énye ya nsógbu.

Ebé niile dara júú, Izunna pútakwuó na aju

“Ó gini na émé ébè à?”

Ganiyu kówara ya, si yà nyérè ya àka yóbà nwunye ya, na ómaghí ébè ó ga ési nwete Òkpa di ókú na abali ahù.

“Asi! Asi ka ína àsi Ganiyu, óburú na ma afúró Òkpa kita kita, įga àkwalú ngwóngwó gi niile púó na Yard à”

Izunna tie mkpu ózùgbò

“Ógaghi ékwé ómùmé!”

Onaedo wéé kwa Ganiyu àká

“Anà m adó únú n’abúó àkà na nti, óburú na Ganiyu apúrò kita, agam àkwára ibú mu niile kwapú na úló gi”

Ókwú ahu ményére Ganiyu ezigbó újó na arú, ózugbó ózugbó ó banye na úló ónye nche ya, chiri akpa ya púó.

“Idiot” ka Onaedo kwúrú ka ó purú

***

Izunna éhighi úra nà àbali ahí. Sò ifé ó na éche bú ótú Mallam Ganiyu siri lekóta ya na úmú nwanne ya ànya mgbé ha pére mpè. Nne na nna ya zúrú ha ina àkwanye ndi órú úgwù.

Nna ha ga àtugharí na iyi ya ma óbúru na ófu ótú esi wee chúpú Mallam Ganiyu. Kedú maka nne ya? Kédu ife ó ga àgwa ya ma ó si ómugwó ó jere nata?

Lékwanú ifé nwanyi na afó ime ya na émè.

Mba! Anàghi éji ifé ojóó àkwúgachi ife óma. Izunna si na akwa ya manie, chiri akpúkpúkwú ya tinye n’ukwu. Onaedo wéé tugharia júo ya

“Kédu ébé iji àbali éje bikonu?”

Ízunne fu féré ísí ya, kita ka óghótà na obú abali.

“Ogbasara gi?” ka ó zara nwunye ya.

Nwa óbele ógé, ife a àna ànú  n’ókpóro ama bu ónu Izunna ka óna éti

“Mallam Ganiyu, Mallam Ganiyu, Mallam Ganiyu”

Ójeteró aka túpú ófu ya ka ónórò na akúku ónu úzó ama Estate ha.

Mallam Ganiyu múru ónu óchi bi úto, ole na ole ànya mmiri gbapúru Izunna na anya.  

Njedebe.

P:S: Been thinking of this for long, final push inspired by Flavor’s new album, the track titled ‘Our Igbo’. Igbo amaka!

Ejebe, Ejebe na Anambra, be Achalugo, ezigbo nwunye di ya ji eme onu, osi gi “na acha nu!”

If you see Flavor greet him for me o, o siri Achalugo golibe in track six 😍

Udo na Ifunanya,
Achalugo.

Advertisement

10 thoughts on “ÓCHÚCHÚ MALLAM GANIYU (The Sack of Mallam Ganiyu)

  1. hehehe! seriously!! i cudnt read a sentence. dts very bad menh! i no sm peeps wud bite of thr tongue while reading out. kudos to u..a lagosian yet writes igbo izugbe so well..kip it up

    Liked by 1 person

What do you think? Let us know

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out /  Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out /  Change )

Connecting to %s